Ụmụ nne Abrahamụọgụ Anụsịobi Madụ.
Ji bụ eze nkpụrụ ihe oriri ndị
ọzọ ana akụ n’ubi.
Ya mere iji akpọ ya ezeji.
Elechara mụ ya anya na ọba ji dị na Igbo farm Village dị na Stuanton , Virginia were mara na ji bụ eziji na ezie. Ji bụ nwoke eji aga mba. Ịhụ ya lesịa ha anya ebe ekere ha na ọba na ahịrị na ahịrị . Agụ ala!
Afọ eju gị. Ọbụ echeta obi esie ike, HO! HA!
Ji ekelediri gị na ede na jiakpụ.
Unu emela,HO! HA!
Unu bụ ngbado ume, kpọm kwem na ala Igbo mgbe nile rukwa echi ooooooooo!
Ya gazie
Ụmụ nne Abrahamụọgụ Anụsịobi Madụ.

Ndeewo nụ.
1. Ebe (the beatle) sị ụmụ ya ha ritụ ji ha tatụ mgbọrọgwụ maka ndị nwe ji e mee gwuru ji ha.
2. Abịrịka anaghị abụ nri onye aha ya wụ Ọbaji.
3. Agụrụ anaghị egbu onye nna ya kere aka ọba ji asaa.
4. Onye kọrọ ji kọọ mbana ekwekwala ka mbana kwụgbuo ji.
Akuma-Kalu Njoku,
Nwa Ticha
|